top of page
  • NKK-Foundation (NGO)
  • Facebook NK-Kindness Foundation
  • Instagram - NK-Kindness Foundation (NGO)
  • NK-Kindness-Foundation NGO
  • TikTok - NK-Kindness Foundation (NGO)
  • X - NK Kindness Foundation NGO
  • NK-Kindness Youtube Channel
abstract-black-waves-background-texture-pattern-2026-01-07-23-14-41-utc.jpg
Okwu Si N‘Ọnụ Onye 
Mmepụta Ọrụ A
Word From The Producer

[IGBO VERSION]

 

Okwu Si N‘Ọnụ Onye Mmepụta Ọrụ A

Ekpere na Ebumnobi m ọtụtụ afọ gara aga bụ ime ka Baịbụl Nsọ dịịrị ndị na-asụ asụsụ Igbo mfe inweta n'akụkụ ụwa niile. Ọ bụ site n’Ebumnobi nke a, ka e si mụpụta Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ, nke bụ Ọdio Agba Ochie na Agba Ọhụrụ Baibụl zuru ezu n'asụsụ Igbo.

 

E hiwere ọrụ a iji mee ka ndị mmadụ, n'agbanyeghị afọ ole ha dị, ọnọdụ ha, ma ọ bụ ebe ha si, nwee ike ige Okwu Chineke n'asụsụ kacha dị ha nso n'obi. Bido ugbua gaba n’iru, mmadụ nwere ike iji ekwentị mkpanaaka (mobile phone), ma ọ bụ udi kọmputa dị iche iche gee Baịbụl Nsọ, n’agbanyeghị ma ọ nọ n'ụlọ, n’ama, n'ọrụ, na njem, ma ọ bụkwa n'oge ekpere na n’oge ntụgharị uche.

 

E mere Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ k’ọbaara ndị na-asụ asụsụ Igbo n'akụkụ ụwa niile uru, tinyekwara ndị okenye, ndị ejeghị nnukwu akwụkwọ, ndị nwere nsogbu anya, ndị Igbo bi n'akụkụ ụwa dị iche iche, nakwa ụmụaka n’etolite etolite, ndị chọrọ inwe njikọ siri ike n’okwukwe ha, n’asụsụ ha, nakwa n’omenala obodo ha.

 

Ọrụ a abụghị naanị Nchịkọta na Ndekọta Ọdio nke Baịbụl Nsọ. Ọ bụ mgbalị e ji eme ka ozi nke Oziọma ruo ọtụtụ mmadụ karịa ka ọ dị na mbụ. Ọ na-echekwa ma na-akwalitekwa asụsụ Igbo n'otu aka ahụ. Site n'ịga n'ihu na-emezi ma na-emepewanye ọrụ a, olileanya anyị bụ na ebe a (platform), ga-anọgide bụrụ ebe bara nnukwu uru nye ọgbọ nke ugbu a, nakwa nke ga-abịa n'ọdịnihu, n’ihe banyere okwukwe nke mmụọ ha.

 

Ekpere si m n'obi bụ ka onye ọ bụla na-ege Baịbụl Nsọ Ọdio nke a, nweta agbamume n'okwukwe, sie ike n'olileanya, bie ndụ Chukwu, ma kesaara ndị ọzọ Oziọma nke Kraịst. Ka ọrụ mmepụta Ọdio nke a nye aka n’ụzọ ọ bụla, iweta ọtụtụ mmadụ nso n’ebe Chukwu nọ, ma mee ka okwukwe nke Ndị Kraịst na-asụ asụsụ Igbo siwanye ike n'akụkụ ụwa niile.

 

John-Paul Ogbonna Eke
Onye Mmepụta, Igbo Audio Bible Project
NK-Kindness Foundation

[ENGLISH VERSION]

 

Word From The Producer

For many years, it has been my prayer and desire to make the Holy Bible more accessible to Igbo-speaking people around the world. This vision gave rise to the Igbo Audio Bible — a complete audio recording of both the Old and New Testaments in the Igbo language.

 

This project was developed to enable people of all ages and backgrounds to listen to the Word of God in a language that speaks directly to their hearts. Whether at home, at work, while travelling, or during moments of prayer and reflection, listeners can access the Scriptures through their mobile phones, tablets, or computers.

 

The Igbo Audio Bible is intended to serve Igbo-speaking communities across the world, including elderly persons, individuals with limited literacy skills, people living with visual impairments, members of the diaspora, and younger generations seeking to maintain a connection with their faith, language, and cultural heritage.

 

More than a collection of audio recordings, this project is an effort to make the message of the Gospel available to a wider audience while preserving and promoting the Igbo language at the same time. Through regular updates and continued development, it is our hope that this platform will remain a valuable spiritual resource for present and future generations.

 

My sincere prayer is that every listener will be encouraged in faith, strengthened in hope, inspired to live according to God's Word, and empowered to share the Good News with others. May this work contribute, in its own small way, to bringing more people closer to God and to deepening the faith of Igbo-speaking Christians throughout the world.

John-Paul Ogbonna Eke
Producer, Igbo Audio Bible Project
NK-Kindness Foundation

bottom of page