top of page
  • NKK-Foundation (NGO)
  • Facebook NK-Kindness Foundation
  • Instagram - NK-Kindness Foundation (NGO)
  • NK-Kindness-Foundation NGO
  • TikTok - NK-Kindness Foundation (NGO)
  • X - NK Kindness Foundation NGO
  • NK-Kindness Youtube Channel
abstract-black-waves-background-texture-pattern-2026-01-07-23-14-41-utc.jpg
FAQ
AJỤJỤ GỊ MAKA IGBO ỌDIO BAIBỤL

IGBO

Ajụjụ: Gịnị bụ “Igbo Audio Bible Project”?
Azịza: "Igbo Audio Bible Project" bụ ọrụ pụrụ iche nke NK-Kindness Foundation, nke na-enye ndị mmadụ ohere ige Baịbụl Nsọ n'asụsụ Igbo n'efu site n'ịntanetị. E hiwere ọrụ a iji mee ka Okwu Chineke dịrị ndị na-asụ asụsụ Igbo mfe inweta n'akụkụ ụwa niile, karịsịa ndị okenye, ndị nwere nkwarụ anya, ndị nwere obere ohere ije akwụkwọ, ndị Igbo bi n'akụkụ ụwa dị iche iche, nakwa onye ọ bụla na-ahụ na ọ na-adịrị ya mfe ige Okwu Chineke ege karịa ịgụ ya agụ n'akwụkwọ.

Ajụjụ: Kedụ ụdị Baịbụl e ji mepụta Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ?
Azịza:
Baịbụl Nsọ Ọdio n'Igbo dabere na Baịbụl Nsọ – Nhazi Katọlik, nke e bipụtara n'asụsụ Igbo, nke si na New Revised Standard Version (NRSV) – Catholic Edition. A gụrụ ma wepụta Ọdio ndị a n'onwe ha nke a kpọrọ Igbo Audio Bible Project. Ozi ndị ọzọ gbasara Baịbụl e ji rụọ ọrụ a, nkwanye ùgwù nye ndị mepụtara ha, ikike, na ozi ndị ọzọ ka edepụtara na "Copyright Notes" nakwa na "Legal & Publishing Information" nke ọrụ a.

Ajụjụ: Baịbụl Nsọ Ọdio n'Igbo ọ bụ n'efu? Enwere m ike ịkesara ya ndị ọzọ?
Azịza:
Ee. A na-enye onye ọ bụla Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ n'efu, nakwa maka agụmakwụkwọ (mmụta), ọrụ ụkà, nakwa ebumnuche ndị ọzọ dị iche iche, nke na-abụghị azụmahịa. Anyị na-agba ndị na-ege ya ume ka ha kesaara ya ndị ezinụlọ ha, ndị enyi ha, ndị ụka ha, na ndị obodo ha. Mana, amachibidoro mmepụtagharị ya, ime mgbanwe, ikewapụtagharị ya ọzọ, ma ọ bụ iji Ọdio ndị a ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e mepụtara n‘ọrụ a, zụọ ahịa na-enweghị nkwenye e dere ede sitere n‘aka ndị NK-Kindness Foundation.

Ajụjụ: Ndị Ụka, ụlọ akwụkwọ, ụlọọrụ ndị Obodo, ụlọ ọgwụ, ma ọ bụ òtù ime obodo, hà nwere ike iwere Baịbụl Nsọ Ọdio n'Igbo?
Azịza:
Ee. Anyị na-akwado ndị ụka, ndị ụlọ akwụkwọ, ndị ụlọ ọgwụ, ebe a na-elekọta ndị agadi, ụlọ mkpọrọ, òtù ime obodo, na ụlọ ọrụ ndị ọzọ dị iche ewepụ ndị ọzụahịa, ka ha jiri Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ mee ihe ndị ụka, ozioma Chineke, ọrụ nlekọta ime mmụọ, uto ime mmụọ, nakwa maka agụmakwụkwọ (mmụta) nke onye ọ bụla. Okwe mee,  nkwanye ugwu unu ga-agara onye mepụtara Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ nke a nakwa ndị NK-Kindness Foundation. Unu ga-esikwa na websaịtị ha kesaa Ọdio nke a, karịa isi ụzọ ọzọ kesaa oyiri ya.

Ajụjụ: Enwere m ike isi n‘Intanetị budata Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ n'igwe nke m?
Azịza:
Ohere isi n’Intanetị budata Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ n'ozuzu ya, na-abịa n’ọdịnihu. A ga-eme k’onye ọ bụla debanyere aha ya na Websaitị anyị mara ozigbo ma nke a.  Mgbe enyere ohere nke a, ọ ga-abụ nke naanị gị, nke ndị ụlọ akwụkwọ, ndị ụka, nakwa maka ebumnuche ndị ọzọ na-abụghị maka azụmahịa.

Ajụjụ: A ga-anọgide na-emezi ma na-emelite Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ?
Azịza:
Ee. Anyị bu n'obi ịga n'ihu na-emezi ma na-emepewanye Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ. Anyị na-aga nihu na-eme ka ọ dịrị onye ọ bụla mfe ige Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ site n’imegharị usoro ngụpụta okwu, otu osi ada n’antị, itinye ihe ọhụrụ ndị ọzọ eji ege okwu n’ime ya, nakwa ị nabata atụmatụ ọhụrụ ndị mmadụ ndị ọzọ, ndị nke ga-eme ka Okwu Chineke dịrị ndị na-asụ asụsụ Igbo mfe inweta n'akụkụ ụwa niile. Ị ga enweta ozi ihe ọhụrụ ọ bụla site na-ije na websaịtị anyị www.nk-kindness-foundation.org/en/igbo-audio-bible nakwa ebe mgbasa okwu anyị ndị ọzọ (Social Media Platforms).


ENGLISH
Q: What is the Igbo Audio Bible Project?
A: The Igbo Audio Bible Project is a special initiative of NK-Kindness Foundation that provides free online access to a complete audio recording of the Holy Bible in the Igbo language. It has been developed to make God's Word more accessible to Igbo-speaking people around the world, particularly elderly persons, individuals with visual impairments, people with limited literacy skills, members of the global Igbo diaspora, and anyone who prefers listening to Scripture rather than reading printed text.


Q: Which Bible translation is used for the Igbo Audio Bible?
A: The Igbo Audio Bible is based on the published Igbo Catholic Bible text (Baịbụl Nsọ – Nhazi Katọlik), which is derived from the New Revised Standard Version (NRSV) – Catholic Edition. The audio recordings have been independently narrated and produced as part of the Igbo Audio Bible Project. Additional information regarding the source text, acknowledgements, copyright, and publishing information is available in the project's Copyright Notes and Legal & Publishing Information sections.

Q: Is the Igbo Audio Bible free to use and may I share it with others?
A:
Yes. The Igbo Audio Bible is provided free of charge for personal, educational, church, and other non-commercial use. We encourage listeners to share links to the platform with family members, friends, churches, and communities. However, reproduction, modification, redistribution, or commercial use of the audio recordings or other original project materials without prior written permission from NK-Kindness Foundation is not permitted unless otherwise stated.

Q: Can churches, schools, ministries, hospitals, or community organisations use the Igbo Audio Bible?
A:
Yes. We encourage churches, schools, hospitals, care homes, prisons, community organisations, and other non-commercial institutions to use the Igbo Audio Bible for worship, education, pastoral care, outreach, and personal spiritual growth. Where possible, we kindly request that users acknowledge the Igbo Audio Bible Project and NK-Kindness Foundation and share links to the official website rather than redistributing copies of the recordings.

Q: Can I download the Igbo Audio Bible?
A:
The availability of downloads may vary depending on the specific content and platform through which the Igbo Audio Bible is accessed. Where downloads are made available, they are intended for personal, educational, church, and other non-commercial use. If downloads are not available, listeners are encouraged to use the online streaming service provided through our website and to subscribe in order to be informed when the universal “Downloads” possibility will be made available on our website.  

Q: Will the Igbo Audio Bible continue to be updated?
A:
Yes. We intend to continue improving and developing the Igbo Audio Bible platform over time. Future updates may include improved reading style, enhanced audio quality, additional features, improved accessibility, new supporting resources, and other improvements that help make God's Word more accessible to Igbo-speaking communities around the world. Any significant updates will be announced through our website and official social media channels.

bottom of page