top of page

Maka Nkwado Na Agbamume Unu
Dedication

IGBO VERSION
IRARA NYEFEE N’AKA – MAKA NKWADO NA AGBAMUME UNU
Nke mbụ na nke kachasị mkpa, a na m arara ọrụ a nye Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, Onye bụ Isi Iyi Nke Ndụ, Okwukwe, Amamihe, na Ike. Ọ bụ naanị site n'amara Ya ka e chepụtara, kwadoo, ma mechaa ọrụ a. Ka Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ nke a bụrụ ụzọ e si enye Aha Ya Dị Nsọ otito, ma wetara ọtụtụ mmadụ Okwu Ya ruo ọtụtụ ọgbọ na-abịa.
A na m eji ịhụnanya na nsọpụrụ rara Igbo Ọdio Baịbụl Nsọ nke a nye ncheta nne m nwụrụ anwụ, Oriakụ Agnes Eke (née Oparaocha), onye ọṅụ ọ na-enwe mgbe ọ na-anụ Okwu Chineke n'asụsụ Igbo ghọrọ mkpali nke butere ọrụ a. A na-ararakwa ya nye nna m nwụrụ anwụ, Nnaa Michael Ogbonna Eke (Cathechist - Sacred Heart Parish, Enugu, 1970 - 1976).
Ekele pụrụ iche ka m na-enyekwa nwunye m, onye nke m hụrụ n'anya, Sandra Nkoli Nneoma Eke (née Iwuchukwu), maka agbamume, ndidi, nghọta, na nkwado ya n'oge niile e ji rụọ ọrụ a.
Ọrụ a nabatakwara mbọ na ịhụ ụzọ maka Ọbịanihu nke ndị Otu Igbo Katọlik Bishọp hụrụ maka mkpa ọ dị iwepụta n'ịkwalite mmepụta Igbo Baịbụl pụrụ iche n'asụsụ Igbo edere ede n‘akwụkwọ, nabatakwa ọtụtụ Ndị Ụkọchukwu, Ndị Ọkà Mmụta, Ndị Ntụgharị Asụsụ, Ndị Nnyocha bụ ndị nyochara edemede ntụgharị okwu nke a, na Ndị Ndu Ụka ndị tinyere aka n'ime ka mbipụta Baịbụl Igbo bụrụ eziokwu.
Nnukwu nsọpụrụ pụrụ iche na-agara Rev. Fr. Prof. Christopher A. Ifenatuora nke nwụrụ anwụ na ndị ya na ya rụkọrọ ọrụ n'ịtụgharị asụsụ Baịbụl nke a, yana ndị Bishọp nakwa ndị isi ụka nyere ntụzi aka ma kwadoo usoro mbipụta ya.
Ekele m na-agakwara ndị Society of St. Paul Nigeria, ndị bipụtara ederede mbụ nke akwụkwọ a, nke esi n‘ime ya wepụta Igbo Ọdio Baịbụl eji ọnụ gụpụta.
Ekele m miri emi na-agakwara Onye Oziọma Ebuka Obi, Onye Isi ndị Zion Prayer Movement Outreach, Ngor Okpala, Imo State, Naịjirịa, maka ozi ime mmụọ atọ dị iche iche o nyere n'afọ 2025 banyere m, bụkwa ndị gbara m ume ime ka ọrụ a gaa n'ihu ngwa ngwa ma nwee ike mechaa ọrụ Baịbụl Nsọ Ọdio nke a n'afọ 2026.
N'ikpeazụ, a na-arara ọrụ a nye ọtụtụ nde, ndị na-asụ Igbo gburugburu ụwa niile, ọkachasị Ndị Agadi, Ndị Isi (nwere nsogbu anya), Ndị ịgụ ihe na-enye nsogbu, na ọgbọ ndị na-abịa n'ihu, ndị chọrọ ịnụ Okwu Chineke n'asụsụ ejiri mụọ ha.
Ka Okwu Chineke na-aga n'ihu na-enye obi mmadụ ìhè, na-akasi mkpụrụobi obi, ma na-edu ọtụtụ mmadụ n'ụzọ eziokwu site n'asụsụ Igbo ruo ọtụtụ ọgbọ ndị a ka ga-amụ. Amen!
ENGLISH VERSION
DEDICATION
First and foremost, I dedicate this work to Almighty God, the source of life, faith, wisdom, and strength. It is by His grace alone that this project was conceived, sustained, and brought to completion. May this Audio Bible serve to glorify His Holy Name and bring His Word to countless people for generations to come.
This Igbo Audio Bible is lovingly dedicated to the memory of my late mother, Mrs. Agnes Eke (née Oparaocha), whose joy in hearing God's Word in Igbo inspired this project, and to my late father, Mr. Michael Ogbonna Eke (Cathechist – Sacred Heart Parish, Enugu, Nigeria from 1970 – 1976).
I am also deeply grateful to my amiable wife, Mrs. Sandra Nkoli Nneoma Eke (née Iwuchukwu), for her encouragement, patience, and support throughout this journey.
This work further acknowledges the vision of the Igbo Catholic Bishops who championed the creation of a dedicated Igbo Bible text, and the many clergy, scholars, translators, reviewers, and church leaders whose commitment made the publication of the Igbo Bible possible.
Special recognition is extended to Rev. Fr. Prof. Christopher A. Ifenatụọra (of blessed memory) and his fellow translators and collaborators, as well as to the Bishops and Church Authorities who guided and approved the publication process.
Appreciation is also extended to the Society of St. Paul Nigeria for publishing the original Igbo Bible text upon which this audio project is derived.
My profound gratitude also goes to Evangelist Ebuka Obi, the Spiritual Director of Zion Prayer Movement Outreach, Ngor Okpala, Imo State, Nigeria, for three separate spiritual messages he delivered in 2025, which encouraged me to accelerate and ultimately complete this Bible project in 2026.
Finally, this work is dedicated to millions of Igbo-speaking people around the world, especially the elderly, the visually impaired, those with limited literacy, and future generations who desire to hear God's Word in the language of their heart.
May the Word of God continue to enlighten hearts, bring comfort to souls, and guide many people through the Igbo language for generations yet unborn. Amen!

bottom of page
